Abụ nke Abụ 8:7
Song of Songs 8:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya, osimiri niile enwekwaghị ike iri ya. Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya, a ga-eleda ya anya nke ukwuu.
Song of Songs 8:7 in English
Song of Songs 8:7 · Berean Standard Bible
Mighty waters cannot quench love; rivers cannot sweep it away. If a man were to give all the wealth of his house for love, his offer would be utterly scorned.
Context
5Onye bụ onye a si nʼọzara na-abịa,
onye na-adabere nʼahụ onye ọ hụrụ nʼanya. 6(5) Nʼokpuru osisi apụl ka m kpọtere gị;
nʼebe ahụ ka nne gị tụrụ ime gị;
nʼebe ahụ ka ọ nọ mụọ gị.
(6) Tụkwasị m dịka mgbaaka ihe a kara nʼobi,
dịka mgbaaka ihe a kara nʼaka gị
nʼihi na ịhụnanya dị ike dịka ọnwụ,
ekworo* ya dịkwa ike dịka ala mmụọ.
Ọ na-enwupụtakwa dịka ọkụ na-ere ere,
dịka ọkụ nke dị ukwu. 7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu. 8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta
ma ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,
nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? 9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;
ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,
anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.