Abụ nke Abụ 8:9
Song of Songs 8:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi, anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya; ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ, anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya.
Song of Songs 8:9 in English
Song of Songs 8:9 · Berean Standard Bible
If she is a wall, we will build a tower of silver to protect her. If she is a door, we will enclose her with panels of cedar.
Context
7Ọtụtụ mmiri apụghị imenyụ ịhụnanya,
osimiri niile enwekwaghị ike iri ya.
Ọ bụrụ na mmadụ ga-enye
akụ niile nke ụlọ ya nʼihi ịhụnanya,
a ga-eleda ya anya nke ukwuu. 8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta
ma ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,
nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? 9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;
ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,
anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. 10Abụ m mgbidi,
ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.
Otu a ka m siri dị nʼanya ya
dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,
o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta
puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.*
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.