Abụ nke Abụ 8:10
Song of Songs 8:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Abụ m mgbidi, ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu. Otu a ka m siri dị nʼanya ya dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju.
Song of Songs 8:10 in English
Song of Songs 8:10 · Berean Standard Bible
I am a wall, and my breasts are like towers. So I have become in his eyes like one who brings peace.
Context
8Anyị nwekwara otu nwanne nwanyị nta
ma ọ kpụbeghị ara.
Gịnị ka anyị ga-emere nwanne anyị nwanyị,
nʼụbọchị a ga-abịa ịlụ ya? 9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;
ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,
anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. 10Abụ m mgbidi,
ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.
Otu a ka m siri dị nʼanya ya
dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,
o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta
puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.* 12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.
Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,
ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.