Abụ nke Abụ 8:12
Song of Songs 8:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye. Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn, ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ.
Song of Songs 8:12 in English
Song of Songs 8:12 · Berean Standard Bible
But my own vineyard is mine to give; the thousand shekels are for you, O Solomon, and two hundred are for those who tend its fruit.
Context
10Abụ m mgbidi,
ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.
Otu a ka m siri dị nʼanya ya
dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,
o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta
puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.* 12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.
Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,
ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. 13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,
gị na ndị enyi gị,
kwere ka m nụ olu gị. 14Soro m ka anyị pụọ, onye m hụrụ nʼanya,
bịakwute m dịka mgbada,
maọbụ dịka nwa ele
na-awụgharị nʼelu ugwu ebe ụda dị iche iche na-esi isi ụtọ jupụtara.
8:6 Ilu 6:34-35
8:11 Mat 21:33
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.