Abụ nke Abụ 8:11
Song of Songs 8:11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon, o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta. Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.*
Song of Songs 8:11 in English
Song of Songs 8:11 · Berean Standard Bible
Solomon had a vineyard in Baal-hamon. He leased it to the tenants. For its fruit, each was to bring a thousand shekels of silver.*
Context
9Ọ bụrụ na ọ bụ mgbidi,
anyị ga-ewukwasị ụlọ elu ọlaọcha nʼelu ya;
ma ọ bụrụ na ọ bụ ọnụ ụzọ,
anyị ga-eji ibo e ji osisi sida wuo mechie ya, ichebe ya. 10Abụ m mgbidi,
ara m abụọ guzokwa dịka ụlọ elu.
Otu a ka m siri dị nʼanya ya
dịka onye na-ewetara ya afọ ojuju. 11Solomọn nwere ubi vaịnị na Baal-Hamon,
o nyefere ubi vaịnị ya nʼaka ndị ọrụ nlekọta.
Onye ọbụla nʼime ha ga-eweta
puku shekel ọlaọcha maka mkpụrụ ọ na-amịta.* 12Ma ubi vaịnị m bụ nke aka m. Ana m enye ya onye m chọrọ inye.
Puku ọlaọcha bụ nke Solomọn,
ndị ọrụ ubi ga-enwetakwa narị ọlaọcha abụọ. 13Gị onye bi nʼubi a gbara ogige,
gị na ndị enyi gị,
kwere ka m nụ olu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.