Native Bible

Psalms 51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 51
1O Chineke, meere m ebere, nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide; nʼihi oke ọmịiko gị, hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile,* ma mee m ka m dị ọcha. 3Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide, mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị, nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu, na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 5Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m; bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m. 6Nʼezie, ị na-achọ eziokwu nʼakụkụ niile zoro ezo; ị na-akụziri m amamihe nʼakụkụ niile zoro ezo. 7Were hisọp* sachaa m, aga m adị ọcha; sachaa m ka m dị ọcha karịa snoo. 8Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ; ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. 9Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị, hichapụkwa mmehie m niile. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị, anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị, ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 13Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị, ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. 14O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. 15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. 18Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem. 19Mgbe ahụ, a ga-enwe ezi aja, aja nsure ọkụ nke ga-atọ gị ụtọ; mgbe ahụ, a ga-achụkwa aja ọtụtụ oke ehi nʼelu ebe ịchụ aja gị. 51:2 Aịz 43:25; Aịz 44:22; Kọl 2:14. 51:7 Nʼoge mmemme idebe ihe ọcha, ọ bụ ahịhịa hisọp ka a na-eji efesa ọbara.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.