Native Bible

Psalms 51:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.

Psalms 51:16 in English

Psalms 51:16 · Berean Standard Bible

For You do not delight in sacrifice, or I would bring it; You take no pleasure in burnt offerings.

Context

14O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. 15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m, ka m kwupụta otuto gị. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya. Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ. 17Aja Chineke chọrọ bụ mmụọ tiwara etiwa, O Chineke, ị naghị elefu anya, nʼobi tiwara etiwa na nke nwere ezi nchegharị. 18Ka ọ masị gị inye Zayọn ọganihu; i wulie mgbidi niile nke Jerusalem.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.