Abụ Ọma 51:14
Psalms 51:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara, Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m, ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị.
Psalms 51:14 in English
Psalms 51:14 · Berean Standard Bible
Deliver me from bloodguilt, O God, the God of my salvation, and my tongue will sing of Your righteousness.
Context
12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m. 13Mgbe ahụ, aga m enwe ike izi ndị njehie ụzọ gị,
ndị mmehie ga-echegharị lọghachikwute gị. 14O Chineke, zọpụta m site nʼikpe ọmụma nke mwụfu ọbara,
Chineke, gị bụ Chineke Onye nzọpụta m,
ire m ga-abụ abụ banyere ezi omume gị. 15O, Onyenwe m, meghee ọnụ m,
ka m kwupụta otuto gị. 16Ị naghị enwe mmasị nʼaja, ma ọ bụghị ya, agaara m eweta ya.
Ị naghị enwe mmasị nʼaja nsure ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.