Abụ Ọma 51:3
Psalms 51:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na amaara m njehie m niile, mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile.
Psalms 51:3 in English
Psalms 51:3 · Berean Standard Bible
For I know my transgressions, and my sin is always before me.
Context
1O Chineke, meere m ebere,
nʼihi ịhụnanya gị nke na-adịgide adịgide;
nʼihi oke ọmịiko gị,
hichapụ njehie m niile. 2Sachapụ mmehie m niile,*
ma mee m ka m dị ọcha. 3Nʼihi na amaara m njehie m niile,
mmehie m dịkwa nʼihu m mgbe niile. 4Ọ bụkwa naanị gị ka m mehiere megide,
mee ihe ahụ bụ ihe ọjọọ nʼihu gị,
nke mere na ị bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi mgbe ị na-ekwu okwu,
na onye ezi omume mgbe ị na-ekpe ikpe. 5Nʼezie, onye mmehie ka m bụ site nʼoge amụrụ m;
bụrụkwa onye mmehie site nʼoge nne m tụrụ ime m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.