Abụ Ọma 51:10
Psalms 51:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke, nwogharịa ezi mmụọ nʼime m.
Psalms 51:10 in English
Psalms 51:10 · Berean Standard Bible
Create in me a clean heart, O God, and renew a right spirit within me.
Context
8Mee ka m nụrụ olu obi ụtọ na ọṅụ;
ka okpukpu ndị i gwepịara ṅụrịkwaa. 9Zopu ihu gị nʼebe mmehie m niile dị,
hichapụkwa mmehie m niile. 10Kee obi dị ọcha nʼime m, O Chineke,
nwogharịa ezi mmụọ nʼime m. 11Achụpụla m nʼihu gị,
anapụkwala m Mmụọ Nsọ gị. 12Nyeghachikwa m ọṅụ nke nzọpụta gị,
ma jiri ezi mmụọ kwagide m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.