Abụ Ọma 45
Psalms 45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ. 2I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi. 3Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. 4Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya. 5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị. 6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ 7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. 11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” 12Ada Taịa* ga-eji onyinye bịa;
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma. 13Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya;
ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya. 14Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị;
ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi
mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. 15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha;
ha bara nʼime ụlọeze. 16Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị;
ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile. 17Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile;
nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi.
45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13.
45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.