Native Bible

Psalms 45:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile.

Psalms 45:16 in English

Psalms 45:16 · Berean Standard Bible

Your sons will succeed your fathers; you will make them princes throughout the land.

Context

14Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. 15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze. 16Ụmụ gị ndị ikom ga-anọchi anya nna nna gị; ị ga-eme ka ha bụrụ ndịisi nʼala ahụ niile. 17Aga m eme ka echeta ihe banyere gị ruo ọgbọ niile; nʼihi nke a, mba niile ga-eto gị ruo mgbe niile ebighị ebi. 45:8 Nke a bụ mmanụ isi ọma a na-efesa nʼuwe. Ọ nọ nʼọnọdụ ihe anyị na-akpọ senti taa. Abk 1:12-13. 45:12 Eze mbụ kwụnyeere ọchịchị alaeze Devid bụ eze obodo Taịa, nʼihi Solomọn na eze Taịa nweere ezigbo mmekọrịta dị mma. Taịa bụ isi obodo ebe niile a na-azụ ahịa nʼakụkụ osimiri Mediterenịan.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.