Native Bible

Psalms 45:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya.

Psalms 45:13 in English

Psalms 45:13 · Berean Standard Bible

All glorious is the princess in her chamber; her gown is embroidered with gold.

Context

11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike. Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” 12Ada Taịa* ga-eji onyinye bịa; ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma. 13Adaeze, lee ka o si maa mma dị ukwuu nʼime ụlọ ya; ọ bụ akwa a kpanyere ọlaedo ka e ji dụọ uwe mwụda ya. 14Ụmụ agbọghọ ibe ya, ndị na-amaghị nwoke, na-eso ya bịakwute gị; ọ bụ uwe mwụda a kpanyere ihe ọkpụkpa ka o yi mgbe e dubatara ya nʼụlọeze. 15E ji ọṅụ na obi ụtọ dubata ha; ha bara nʼime ụlọeze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.