Abụ Ọma 45:3
Psalms 45:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike; yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe.
Psalms 45:3 in English
Psalms 45:3 · Berean Standard Bible
Strap your sword at your side, O mighty warrior; appear in your majesty and splendor.
Context
1Isi okwu dị ebube na-akpali mkpụrụobi m,
mgbe m na-agụgharị abụ m nye eze;
ire m bụ mkpisi akwụkwọ dị nʼaka ọka ode akwụkwọ. 2I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi. 3Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. 4Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya. 5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.