Abụ Ọma 45:4
Psalms 45:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri, nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume; ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya.
Psalms 45:4 in English
Psalms 45:4 · Berean Standard Bible
In your splendor ride forth in victory on behalf of truth and humility and justice; may your right hand show your awesome deeds.
Context
2I bụ onye kachasị mma nʼetiti ụmụ mmadụ,
e ji amara tee egbugbere ọnụ gị mmanụ,
ebe ọ bụ na Chineke agọziela gị ruo mgbe ebighị ebi. 3Kenye mma agha gị nʼukwu gị, gị onye dị ike;
yikwasị onwe gị ebube na ịma mma dịka uwe. 4Nʼebube gị, gaa nʼihu nʼime mmeri,
nʼihi eziokwu, na ịdị obi umeala, na ezi omume;
ka aka nri gị gosipụta ọrụ gị niile nke na-eju anya. 5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị. 6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.