Native Bible

Psalms 45:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.

Psalms 45:8 in English

Psalms 45:8 · Berean Standard Bible

All your garments are fragrant with myrrh and aloes and cassia; from palaces of ivory the harps make you glad.

Context

6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ 7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.