Abụ Ọma 45:8
Psalms 45:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia; ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma. Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ.
Psalms 45:8 in English
Psalms 45:8 · Berean Standard Bible
All your garments are fragrant with myrrh and aloes and cassia; from palaces of ivory the harps make you glad.
Context
6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ 7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.