Abụ Ọma 45:10
Psalms 45:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu: “Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị.
Psalms 45:10 in English
Psalms 45:10 · Berean Standard Bible
Listen, O daughter! Consider and incline your ear: Forget your people and your father’s house,
Context
8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. 11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.” 12Ada Taịa* ga-eji onyinye bịa;
ndị ọgaranya ga-achọkwa ka i gosi ha ihuọma.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.