Abụ Ọma 45:9
Psalms 45:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ; nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
Psalms 45:9 in English
Psalms 45:9 · Berean Standard Bible
The daughters of kings are among your honored women; the queen stands at your right hand, adorned with the gold of Ophir.
Context
7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị. 10Gee ntị, gị nwaagbọghọ, tulee ma nụrụkwa ihe m na-ekwu:
“Chefuo ndị gị na ezinaụlọ nna gị. 11Nʼihi na ịma mma gị ga-eme ka eze chọsie gị ike.
Sọpụrụ ya nʼihi na ọ bụ onyenwe gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.