Abụ Ọma 45:7
Psalms 45:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị; ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị, site na ite gị mmanụ nke ọṅụ.
Psalms 45:7 in English
Psalms 45:7 · Berean Standard Bible
You have loved righteousness and hated wickedness; therefore God, your God, has anointed you above your companions with the oil of joy.*
Context
5Ka àkụ gị niile dị nkọ mapuo mkpụrụobi ndị iro niile nke eze;
ka mba niile na-adakwa nʼokpuru ụkwụ gị. 6O Chineke, ocheeze gị ga-adịgide ruo mgbe ebighị ebi,
mkpara omume ziri ezi ka mkpara alaeze gị ga-abụ 7Ị hụrụ ezi omume nʼanya, ma kpọọ ihe ọjọọ asị;
ya mere, Chineke, onye bụ Chineke gị, emeela ka ịdị elu karịa ndị ibe gị,
site na ite gị mmanụ nke ọṅụ. 8Uwe gị niile jupụtara nʼisisi ụtọ nke si na mmanụ* máá na aloos na akashia;
ha sitere nʼụlọeze niile, e ji ọdụ enyi chọọ mma.
Egwu sitere nʼụbọ akwara na-eme ka i nwee obi ụtọ. 9Ụmụ agbọghọ eze nọ nʼetiti ndị inyom gị ka a na-asọpụrụ;
nwunye eze, onye yikwasịrị ọlaedo nke Ọfịa na-eguzo nʼaka nri gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.