Abụ Ọma 46
Psalms 46 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. 2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 3Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela 4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. 6Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze. 7Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela 8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa. 9Ọ na-eme ka agha kwụsị
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,
ma na-esu ọta* agha niile ọkụ. 10Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.” 11Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
46:9 Maọbụ, ụgbọ agha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.