Abụ Ọma 46:8
Psalms 46:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere, lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa.
Psalms 46:8 in English
Psalms 46:8 · Berean Standard Bible
Come, see the works of the LORD, who brings devastation upon the earth.
Context
6Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze. 7Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela 8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa. 9Ọ na-eme ka agha kwụsị
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,
ma na-esu ọta* agha niile ọkụ. 10Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.