Abụ Ọma 46:9
Psalms 46:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-eme ka agha kwụsị ruo nsọtụ nke elu ụwa niile. Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe, ma na-esu ọta* agha niile ọkụ.
Psalms 46:9 in English
Psalms 46:9 · Berean Standard Bible
He makes wars to cease throughout the earth; He breaks the bow and shatters the spear; He burns the shields * in the fire.
Context
7Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela 8Bịa, hụrụ ihe ebube niile Onyenwe anyị mere,
lee oke ịla nʼiyi niile o webatara nʼelu ụwa. 9Ọ na-eme ka agha kwụsị
ruo nsọtụ nke elu ụwa niile.
Ọ na-agbaji ụta, na-ebibi ùbe,
ma na-esu ọta* agha niile ọkụ. 10Ọ na-asị, “Nọọnụ juu! Maranụ na mụ onwe m bụ Chineke!
A ga-ebuli m elu nʼetiti mba niile,
a ga-ebulikwa m elu nʼụwa.” 11Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile nọnyere anyị;
Chineke nke Jekọb bụ ebe mgbaba anyị e wusiri ike. Sela
46:9 Maọbụ, ụgbọ agha
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.