Abụ Ọma 46:4
Psalms 46:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke, nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu.
Psalms 46:4 in English
Psalms 46:4 · Berean Standard Bible
There is a river whose streams delight the city of God, the holy place where the Most High dwells.
Context
2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 3Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela 4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ. 6Mba niile na-agba aghara, alaeze niile na-adakwa;
o welitere olu ya elu, ụwa na-agbaze.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.