Abụ Ọma 46:3
Psalms 46:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ, maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela
Psalms 46:3 in English
Psalms 46:3 · Berean Standard Bible
though their waters roar and foam and the mountains quake in the surge. Selah
Context
1Chineke bụ ebe mgbaba anyị, na ike anyị,
onye inyeaka anyị ka ọ bụ nʼoge nsogbu. 2Nʼihi ya, anyị agaghị atụ egwu, ọ bụladị mgbe ụwa niile na-emebi,
maọbụ mgbe a na-ewezuga ugwu nʼọnọdụ ha, mee ka ha daba nʼoke osimiri. 3Nʼagbanyeghị na mmiri ya na-agba aghara, na-asụkwa ụfụfụ,
maọbụ na ugwu niile na-eme mkpọtụ site nʼoke mbili elu ha. Sela 4Otu iyi dị nke na-asọbata na-eweta ọṅụ nʼime obodo Chineke,
nʼime ebe obibi dị nsọ nke Onye kachasị ihe niile elu. 5Chineke bi nʼime ya, ọ gaghị ada;
Chineke ga-enyere ya aka mgbe chi bọrọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.