Abụ Ọma 10
Psalms 10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? 2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. 3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. 4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. 5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;
ọ na-elelị ndị iro ya niile. 6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”* 7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,*
nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. 8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,
na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. 9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.
Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye. 10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya,
ọ na-azọpịakwa ha. 11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola.
O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”* 12Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị,
echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. 13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,
“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? 14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. 15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile
nke a na-apụghị ịchọpụta. 16Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. 17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, 18Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,
ka mmadụ efu, onye e kere eke,
ghara imenye ha egwu ọzọ.
10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, “Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m”; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, “Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ”
10:7 Ya bụ, ịgba iyi
10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.