Abụ Ọma 10:3
Psalms 10:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya, ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ.
Psalms 10:3 in English
Psalms 10:3 · Berean Standard Bible
For the wicked man boasts in the cravings of his heart; he blesses the greedy and reviles the LORD.
Context
1Onyenwe anyị, gịnị mere i ji na-eguzoro onwe gị nʼebe dị anya?
Gịnị mere ị na-ezo onwe gị nʼoge nsogbu? 2Site na mpako, onye ajọ omume na-emegbu ndị na-adịghị ike,
ndị mpịa mpịa aghụghọ ya mara dịka ọnya. 3Ọ na-anya isi banyere ọchịchọ niile nke obi ya,
ọ na-elelị Onyenwe anyị anya ma na-agọzi ndị oke ọchịchọ. 4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke,
nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. 5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;
ọ na-elelị ndị iro ya niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.