Abụ Ọma 10:15
Psalms 10:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ, kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile nke a na-apụghị ịchọpụta.
Psalms 10:15 in English
Psalms 10:15 · Berean Standard Bible
Break the arm of the wicked and evildoer; call him to account for his wickedness until none is left to be found.
Context
13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya?
Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya,
“Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? 14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. 15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile
nke a na-apụghị ịchọpụta. 16Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. 17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.