Abụ Ọma 10:16
Psalms 10:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi. Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile.
Psalms 10:16 in English
Psalms 10:16 · Berean Standard Bible
The LORD is King forever and ever; the nations perish from His land.
Context
14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute,
ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha.
Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi,
nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna. 15Gbajie aka onye ajọ omume a na-eme ihe ọjọọ,
kpọọ ya ka ọ zaa ajụjụ banyere ajọ omume ya niile
nke a na-apụghị ịchọpụta. 16Onyenwe anyị bụ eze ruo mgbe ebighị ebi.
Ọ ga-esite nʼala ya kpochapụ mba niile. 17O Onyenwe anyị, ị maara ọchịchọ obi ndị niile a na-akpagbu;
ị na-ege ntị na mkpu akwa ha ma kasịekwa ha obi, 18Ị na-echedo ndị na-enweghị nna na ndị niile a na-emegbu emegbu,
ka mmadụ efu, onye e kere eke,
ghara imenye ha egwu ọzọ.
10:6 Ọ na-asị nʼime obi ya, “Agaghị ewezuga m nʼọnọdụ m”; Ọ na-aṅụkwa iyi sị, “Ọ dịghị onye ọbụla ga-eme m ihe ọjọọ”
10:7 Ya bụ, ịgba iyi
10:11 O mechiri anya ya, ọ naghị ahụ ya
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.