Native Bible

Psalms 10:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka.

Psalms 10:12 in English

Psalms 10:12 · Berean Standard Bible

Arise, O LORD! Lift up Your hand, O God! Do not forget the helpless.

Context

10Ụmụ ogbenye ndị a na-ada nʼala nʼihi ịdị ike ya, ọ na-azọpịakwa ha. 11Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Chineke echefuola. O zofuola ihu ya, ọ dịghị mgbe ọ hụrụ ya.”* 12Bilie O Onyenwe anyị! O Chineke welie aka gị, echefukwala ndị na-enweghị onye inyeaka. 13Gịnị mere onye ajọ omume ji na-eleda Chineke anya? Gịnị mere o ji na-asị nʼime obi ya, “Ọ gaghị akpọ m ka m zaa ajụjụ banyere omume m”? 14Ma gị, O Chineke, ị na-ahụ nsogbu na ihe mwute, ị na-atule ihe ị ga-eme banyere ha. Ndị a na-emegbu na-atụkwasị gị obi, nʼihi na ị bụ onye inyeaka ndị na-enweghị nna.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.