Abụ Ọma 10:7
Psalms 10:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,* nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa.
Psalms 10:7 in English
Psalms 10:7 · Berean Standard Bible
His mouth is full of cursing, deceit,* and violence; trouble and malice are under his tongue.
Context
5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma;
ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ;
ọ na-elelị ndị iro ya niile. 6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m.
Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”* 7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,*
nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. 8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche,
nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ,
na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha. 9Dịka ọdụm, ha anaghị eme mkpọtụ ọbụla,
ọ na-eche ịdakwasị ụmụ ogbenye.
Dịka ndị bụ dinta si ejide ụmụ anụmanụ nʼọnya ha siri, otu a ka ha si ejide ụmụ ogbenye.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.