Native Bible

Psalms 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”*

Psalms 10:6 in English

Psalms 10:6 · Berean Standard Bible

He says to himself, “I will not be moved; from age to age I am free of distress.”

Context

4Nʼọnọdụ mpako ya, onye ajọ omume anaghị achọ Chineke, nʼechiche ya niile, ọ naghị eche banyere ya. 5Ma ihe niile ọ na-eme na-agara ya nke ọma; ọ bụ onye na-ebuli onwe ya elu, iwu gị niile dịkwa anya site nʼebe ọ nọ; ọ na-elelị ndị iro ya niile. 6Nʼime obi ya, ọ na-asị, “Ọ dịghị ihe ga-emetụta m. Aga m anọ nʼọnọdụ ọṅụ mgbe niile. Nsogbu ọbụla agaghị adakwasị m.”* 7Ọnụ ya jupụtara nʼokwu ụgha na ịba mba ime ihe ọjọọ,* nʼokpuru ire ya ka nsogbu na ajọ ihe dịkwa. 8Ha na-ezo onwe ha nʼobodo nta dị iche iche, nʼebe zooro ezo ka ha na-anọ, na-eche itigbu ndị aka ha dị ọcha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.