Abụ Ọma 11
Psalms 11 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.
Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,
“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” 2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;
ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,
zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,
ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. 3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,
gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? 4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;
Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.*
Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;
anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,
ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,
ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. 6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume
dịka mmiri ozuzo;
oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha. 7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume,
ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya;
ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya.
11:4 Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.