Native Bible

Psalms 11:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta.

Psalms 11:2 in English

Psalms 11:2 · Berean Standard Bible

For behold, the wicked bend their bows. They set their arrow on the string to shoot from the shadows at the upright in heart.

Context

1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m. Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị, “Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” 2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha; ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha, zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ, ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. 3Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? 4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.* Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.