Abụ Ọma 11:3
Psalms 11:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe a na-ebibi ntọala niile, gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime?
Psalms 11:3 in English
Psalms 11:3 · Berean Standard Bible
If the foundations are destroyed, what can the righteous do?”
Context
1Nʼime Onyenwe anyị ka m mere ebe mgbaba m.
Gịnị mere i ji na-agwa m okwu sị,
“Felagaa nʼelu ugwu gị dịka nnụnụ.” 2Nʼihi na ndị ajọ omume ekweela ụta ha;
ha edoziela àkụ nʼelu eriri ụta ha,
zoo onwe ha nʼakụkụ ụzọ,
ịnọ nʼọchịchịrị, gbaa ndị obi ha ziri ezi ụta. 3Mgbe a na-ebibi ntọala niile,
gịnị ka ndị ezi omume pụrụ ime? 4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya;
Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.*
Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme;
anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule,
ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya,
ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.