Native Bible

Psalms 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha.

Psalms 11:6 in English

Psalms 11:6 · Berean Standard Bible

On the wicked He will rain down fiery coals and sulfur; a scorching wind will be their portion.

Context

4Onyenwe anyị nọ nʼụlọnsọ ukwuu ya; Onyenwe anyị nọkwa nʼelu ocheeze ya dị nʼeluigwe.* Ọ na-ahụzu ihe niile ụmụ mmadụ na-eme; anya ya na-anwalekwa ụzọ ha. 5Onyenwe anyị na-ele onye ezi omume ule, ma onye ajọ omume na ndị niile hụrụ imebi iwu nʼanya, ka ọ na-akpọ asị nke ukwuu. 6Ọ ga-eme ka nkume ọkụ zokwasị ndị ajọ omume dịka mmiri ozuzo; oke ifufe dị ọkụ ga-abụ ihe nketa ha. 7Nʼihi na Onyenwe anyị bụ onye ezi omume, ọ hụkwara ikpe ziri ezi nʼanya; ndị ezi omume niile ga-ahụkwa ihu ya anya. 11:4 Nke a bụ maka ocheeze Onyenwe anyị

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.