Native Bible

Psalms 7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 7
1Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara; zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, 2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. 3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. 4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. 5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela 6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi. 7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu, ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. 8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. 9O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. 10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. 11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị. 12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya. 13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ; ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ. 14Onye ọbụla dị ime ajọ ihe,* na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta. 15Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba nʼime olulu ahụ o gwuru. 16Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi. 17Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya, aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto. 7:10 Maọbụ, Onyenwe m 7:14 Nʼoge ochie, ndị agha izipụta echiche ime ajọ ihe ha, na-eji ihe na-aghọrọ ọkụ ọsịịsọ, techie nʼọnụ àkụ ha, mụnye ha ọkụ, tụnye ha nʼelu ụlọ ndị iro ha, i gbaa ha ọkụ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.