Abụ Ọma 7
Psalms 7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara;
zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, 2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm,
ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. 3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a;
ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. 4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,
maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. 5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;
ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,
mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela 6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị,
bilie megide oke iwe ndị iro m;
teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi. 7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,
ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. 8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.
Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,
na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. 9O Chineke onye ezi omume,
onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ,
mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe
meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. 10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m,
ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. 11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị. 12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị,
ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ,
ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya. 13Ọ kwadoola ngwa agha niile nke ọnwụ;
ọ na-eme ka àkụ ya bụrụ nke na-ere ọkụ. 14Onye ọbụla dị ime ajọ ihe,*
na-atụrụ ime okwu na ụka mụpụtakwa ngharịpụ nke ụgha na-eweta. 15Ma onye ahụ na-egwu olulu na-adaba
nʼime olulu ahụ o gwuru. 16Nsogbu ahụ ọ kpaliri na-abịakwasị ya
ihe ike ahụ ọ kwadooro na-alaghachikwa azụ dakwasị ya nʼisi. 17Aga m enye Onyenwe anyị ekele nʼihi ezi omume ya,
aga m abụku aha Onyenwe anyị, Onye kachasị ihe niile elu abụ otuto.
7:10 Maọbụ, Onyenwe m
7:14 Nʼoge ochie, ndị agha izipụta echiche ime ajọ ihe ha, na-eji ihe na-aghọrọ ọkụ ọsịịsọ, techie nʼọnụ àkụ ha, mụnye ha ọkụ, tụnye ha nʼelu ụlọ ndị iro ha, i gbaa ha ọkụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.