Abụ Ọma 7:3
Psalms 7:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha.
Psalms 7:3 in English
Psalms 7:3 · Berean Standard Bible
O LORD my God, if I have done this, if injustice is on my hands,
Context
1Onyenwe anyị Chineke m, nʼime gị ka m gbabara;
zọpụta m, ma napụta m site nʼaka ndị niile na-achụ m ọsọ, 2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm,
ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. 3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a;
ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. 4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,
maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. 5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;
ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,
mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.