Native Bible

Psalms 7:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m.

Psalms 7:4 in English

Psalms 7:4 · Berean Standard Bible

if I have rewarded my ally * with evil, if I have plundered my foe without cause,

Context

2ma ọ bụ ha adọkaa m dịka ọdụm, ha ga-adọsasịkwa m ebe mmadụ ọbụla enweghị ike ịnapụta m. 3O Onyenwe anyị Chineke m, ọ bụrụ na m mere ihe dị otu a; ọ bụrụkwa na aka m adịghị ọcha. 4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ, maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. 5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m; ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m, mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela 6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.