Abụ Ọma 7:6
Psalms 7:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị, bilie megide oke iwe ndị iro m; teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi.
Psalms 7:6 in English
Psalms 7:6 · Berean Standard Bible
Arise, O LORD, in Your anger; rise up against the fury of my enemies. Awake, my God, and ordain judgment.
Context
4Ọ bụrụ na m jiri ihe ọjọọ kwụghachi onye mụ na ya nọ nʼudo ụgwọ,
maọbụ site nʼụzọ na-ezighị ezi zuo ihe onye iro m. 5Mgbe ahụ, ka onye iro m chụọ m ọsọ, jide m;
ka ọ tụọ m nʼala zọpịa ndụ m,
mee ka m bụrụ onye a ga-ahapụ nʼuzuzu nʼọnọdụ ọdịndụ-ọnwụkamma. Sela 6Bilie, Onyenwe anyị, nʼiwe gị,
bilie megide oke iwe ndị iro m;
teta Chineke m, kpee ikpe ziri ezi. 7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,
ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. 8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.
Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,
na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.