Abụ Ọma 7:9
Psalms 7:9 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike.
Psalms 7:9 in English
Psalms 7:9 · Berean Standard Bible
Put an end to the evil of the wicked, but establish the righteous, O righteous God who searches hearts and minds.*
Context
7Ka nzukọ niile chịkọtara onwe ha ọnụ gbaa gị gburugburu,
ebe ị na-anọkwasịkwa nʼebe dị elu na-achị ha. 8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe.
Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị,
na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. 9O Chineke onye ezi omume,
onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ,
mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe
meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. 10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m,
ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. 11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi,
Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.