Native Bible

Psalms 7:10 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi.

Psalms 7:10 in English

Psalms 7:10 · Berean Standard Bible

My shield is with God, who saves the upright in heart.

Context

8Ka Onyenwe anyị kpee ụmụ mmadụ niile ikpe. Kpee m ikpe, O Onyenwe anyị, dịka ezi omume m si dị, na dịka izuoke m si dị, gị Onye kachasị ihe niile elu. 9O Chineke onye ezi omume, onye na-enyochapụta echiche na obi mmadụ, mee ka ihe ike ndị ajọ omume bịa na njedebe meekwa ka ndị ezi omume guzosie ike. 10Chineke nke kachasị ihe niile elu, bụ ọta* m, ọ na-azọpụta ndị niile obi ha ziri ezi. 11Chineke bụ onye na-ekpe ikpe ziri ezi, Chineke, onye na-ezipụta oke iwe ya kwa ụbọchị. 12Ọ bụrụ na onye ahụ echegharịghị, ọ ga-amụ mma agha ya ka ọ dịrị nkọ, ọ ga-arọgọ ụta ya, kwadokwa ịgba ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.