Abụ Ọma 6
Psalms 6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị, abarala m mba mgbe ị na-ewe iwe.
Atala m ahụhụ nʼoge ọnụma gị. 2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.
Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu. 3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.
Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị? 4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;
nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m. 5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.
O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? 6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.
Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,
ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m. 7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;
ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m. 8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe,
nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile. 9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere.
Ọ nabatala ekpere m. 10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme.
Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.