Abụ Ọma 6:5
Psalms 6:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị. O nwere onye na-eto gị site nʼala ili?
Psalms 6:5 in English
Psalms 6:5 · Berean Standard Bible
For there is no mention of You in death; who can praise You from Sheol?
Context
3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.
Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị? 4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;
nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m. 5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.
O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? 6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.
Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,
ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m. 7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute;
ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.