Abụ Ọma 6:4
Psalms 6:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m; nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m.
Psalms 6:4 in English
Psalms 6:4 · Berean Standard Bible
Turn, O LORD, and deliver my soul; save me because of Your loving devotion.
Context
2Biko, meere m ebere Onyenwe anyị, nʼihi na adịghị m ike.
Gwọọ m, nʼihi na ọkpụkpụ m niile nọ nʼihe mgbu. 3Mkpụrụobi m nọ nʼọnọdụ ihe mgbu.
Ruo ole mgbe, O Onyenwe anyị, ka ị ga-anọgide na-agba m nkịtị? 4Onyenwe anyị, biko, bịa zọpụta m;
nʼihi ịhụnanya gị na-enweghị ọgwụgwụ, napụta m. 5Nʼetiti ndị nwụrụ anwụ ọ dịghị onye na-ekwupụta aha gị.
O nwere onye na-eto gị site nʼala ili? 6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude.
Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri,
ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.