Native Bible

Psalms 6:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile.

Psalms 6:8 in English

Psalms 6:8 · Berean Standard Bible

Depart from me, all you workers of iniquity, for the LORD has heard my weeping.

Context

6Ike agwụla m nʼihi ịsụ ude. Abalị niile, ana m eji ịkwa akwa mee ka ihe ndina m jupụta na mmiri, ana m eji anya mmiri dee ihe ndina m. 7Anya m adịghị ahụzikwa ụzọ nke ọma nʼihi ihe mwute; ọ kaala nka nʼihi mmeso ndị iro m. 8Sitenụ nʼebe m nọ wezuga onwe unu, unu ndị na-eme ajọ ihe, nʼihi na Onyenwe anyị anụla akwa m niile. 9Onyenwe anyị anụla akwa m; ọ nụla arịrịọ nke m na-arịọ ya ka o meere m ebere. Ọ nabatala ekpere m. 10Ka ndị iro m niile bụrụ ndị ihere ga-eme. Ha ga-ada mba, bụrụkwa ndị ga-eji ihere laghachi ebe ha si bịa.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.