Abụ Ọma 8
Psalms 8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!
I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe. 2Site nʼotuto* ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha?
Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta* ha? 5I mere ka ha* dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi* nọ,
I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke,
tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi,
na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile,
na azụ niile,
na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri. 9O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile.
8:2 Mat 21:16
8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi
8:5 Maọbụ, ya
8:5 Maọbụ, Chineke
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.