Native Bible

Psalms 8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Listen to Abụ Ọma 8
1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. 2Site nʼotuto* ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta* ha? 5I mere ka ha* dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi* nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri. 9O Onyenwe anyị, Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile. 8:2 Mat 21:16 8:4 Gịnị ka nwa nke mmadụ bụ na ihe banyere ya na-emetụ gị nʼobi 8:5 Maọbụ, ya 8:5 Maọbụ, Chineke

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.