Native Bible

Psalms 8:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya.

Psalms 8:6 in English

Psalms 8:6 · Berean Standard Bible

You made him ruler of the works of Your hands; You have placed everything under his feet:*

Context

4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta* ha? 5I mere ka ha* dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi* nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze. 6I mekwaala ya ka ọ bụrụ onyeisi nke ihe niile i kere eke, tinyekwa ihe niile nʼokpuru ụkwụ ya. 7Ọ na-achị igwe ewu na atụrụ, na ehi, na ụmụ anụ ọhịa ndị ọzọ niile, 8na nnụnụ niile, na azụ niile, na anụ ndị ọzọ na-ebi nʼime mmiri.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.