Native Bible

Psalms 8:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha,

Psalms 8:3 in English

Psalms 8:3 · Berean Standard Bible

When I behold Your heavens, the work of Your fingers, the moon and the stars, which You have set in place—

Context

1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe. 2Site nʼotuto* ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara, ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị, ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe, hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ, mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando i tinyere nʼọnọdụ ha, 4gịnị ka mmadụ bụ i ji na-eche banyere ha? Gịnịkwa ka mmadụ bụ iji na-elekọta* ha? 5I mere ka ha* dị ala nwantakịrị nʼebe ndị mmụọ ozi* nọ, I jikwa ebube na nsọpụrụ kpube ya nʼisi dịka okpueze.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.