Abụ Ọma 8:1
Psalms 8:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị Onyenwe anyị, lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile! I meela ka ebube gị dị elu nʼime eluigwe.
Psalms 8:1 in English
Psalms 8:1 · Berean Standard Bible
O LORD, our Lord, how majestic is Your name in all the earth! You have set Your glory above the heavens.
Context
1O Onyenwe anyị Onyenwe anyị,
lee ka ịdị ukwuu nke aha gị si jupụta ụwa niile!
I meela ka ebube gị dị elu
nʼime eluigwe. 2Site nʼotuto* ụmụntakịrị na ụmụ na-aṅụ ara,
ị tọọla ntọala siri ike megide ndị iro gị,
ka e si otu a mechie ọnụ onye iro na onye ahụ na-abọ ọbọ. 3Mgbe ọbụla m lere anya na mbara eluigwe,
hụ ọrụ niile nke aka gị rụrụ,
mgbe m lere anya nʼelu hụ ọnwa na kpakpando
i tinyere nʼọnọdụ ha,
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.