Abụ Ọma 63
Psalms 63 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
1O Chineke, ị bụ Chineke m,
e ji m obi m niile na-achọ gị;
akpịrị na-akpọ mkpụrụobi m nkụ,
anụ ahụ m na-achọsi gị ike,
nʼala kpọrọ nkụ na nke ịda mba
ebe mmiri na-adịghị nʼime ya. 2Ahụla m gị nʼụlọnsọ gị,
hụkwa ike gị na ebube gị. 3Nʼihi na ịhụnanya gị dị mma karịa ndụ,
aga m eji egbugbere ọnụ m jaa gị mma. 4Ogologo ụbọchị m niile ka m ga-eto gị,
aga m eweli aka m abụọ elu kpọkuo aha gị. 5Mkpụrụobi m ga-enwe afọ ojuju dịka onye ji ezi nri rijuo afọ;
aga m eji egbugbere ọnụ jupụtara nʼabụ too gị. 6Nʼelu ihe ndina m, ana m echeta gị,
ana m atụgharị uche nʼihe banyere gị, ogologo abalị niile. 7Nʼihi na ị bụ onye inyeaka m,
ana m abụ abụ nʼokpuru ndo nke nku gị. 8Mkpụrụobi m na-arapara gị nʼahụ;
aka nri gị na-ejigide m. 9A ga-ala ndị na-achọ ndụ m nʼiyi;
ha ga-arịda ruo ebe omimi nke ụwa. 10A ga-eji mma agha laa ha nʼiyi,
ha ga-abụkwa nri nye nkịta ọhịa. 11Ma eze ga-aṅụrị ọṅụ nʼime Chineke;
ndị niile na-eji aha Chineke aṅụ iyi ga-eto ya,
ma a ga-eme ka ọnụ ndị niile na-agha ụgha dere duu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.